Zephaniah 3

Ọdịnihu Jerusalem

1Ahụhụ dịrị obodo ahụ ndị mmegbu,
na ndị na-enupu isi, na ndị rụrụ arụ jupụtara nʼime ya.
2Ọ naghị ege onye ọbụla ntị,
ọ dịghị anabata ịdọ aka na ntị.
Ọ dịghị atụkwasị Onyenwe anyị obi,
ọ dịkwaghị abịakwute Chineke ya nso.
3Ndịisi nọ nʼetiti ya
dịka ọdụm na-agbọ ụja,
ndị ọkaikpe ya dịka nkịta ọhịa na-achụ nta anyasị,
nke ihe ọ chụtara na nta adịghị anọ tutu chi abọọ.
4Ndị amụma ya bụ ndị ndu rụrụ arụ,
ha bụkwa ndị aghụghọ.
Ndị nchụaja ya na-emerụ ebe nsọ
na-ejikwa ike emebi iwu.
5Ma Onyenwe anyị, onye nọ nʼetiti ya bụ onye ezi omume.
Ọ nakwaghị eme ihe ọjọọ.
Maọbụ, ihe na-ezighị ezi

Ụtụtụ niile ka ọ na-eme ka ikpe ziri ezi ya pụta ìhè;
ụbọchị ọbụla ọ naghị ahapụ igosi ya,
ma ndị ajọ omume enweghị ihere.

Jerusalem anọgide na nnupu isi

6“Egbuchapụla m mba niile dị iche iche,
kwatukwaa ebe ha niile e wusiri ike.
Ahapụla m okporoụzọ ha ka ọ bụrụ ihe a gbahapụrụ agbahapụ,
Ya bụ, nʼụzọ niile dere duu

ọ dịkwaghị onye na-esi na ha agabiga.
A laala obodo ha niile nʼiyi,
ọ dịkwaghị onye fọdụrụ, ọ bụladị otu onye.
7Asịrị m, banyere Jerusalem,
‘Nʼezie, ị ga-atụ egwu m,
ma nabatakwa ntụziaka.’
Ọ gaghị elegharakwa ntụziaka niile m ziri ya anya

Mgbe ahụ, agaghị ebibi ebe mgbaba ya,
ma ọ bụkwanụ ntaramahụhụ m niile agaghị abịakwasịkwa ya.
Ma otu ọ dị, ọ nụrụ ha ọkụ nʼobi ịga nʼihu
mee omume rụrụ arụ nʼihe niile bụ nke ha mere.
8Nʼihi nke a, cherenụ m,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri,
“nʼụbọchị ahụ m ga-ebili ịgba akaebe.
Ụbọchị m ga-ebili ịkwata ihe

Mkpebi m bụ ịchịkọta mba niile dị iche iche,
na ịkpọkọta alaeze niile,
ịwụkwasị ha oke iwe m,
ọ bụladị ọnụma niile nke iwe m.
Ọkụ, nke iwe si nʼekworo m,
ka a ga-eji rechapụ ụwa niile.

Nlọghachi nke ụmụ Izrel ndị fọdụrụ

9“Mgbe ahụ, aga m anụcha egbugbere ọnụ
Maọbụ, gbanwee okwu ha
ndị niile dị iche iche mee ka ọ bụrụ ihe dị ọcha,
ka ha niile nwee ike ịkpọku aha Onyenwe anyị,
ma jikọta aka fekwaa ya ofufe.
10Site nʼofe osimiri niile nke Kush,
Maọbụ, Itiopia

bụ ndị m a chụsasịrị achụsasị, ndị na-akpọ isiala nye m,
ga-ewetara m onyinye dị iche iche.
11Nʼụbọchị ahụ, gị bụ Jerusalem, agaghị eme ka ihere mee gị,
nʼihi omume njehie niile i jere megide m,
nʼihi na aga m esite nʼetiti gị wezuga ndị gị niile
na-aṅụrị ọṅụ
Ya bụ, ndị na-anya isi
na mpako ha.
A gaghị ahụkwa ndị na-afụli onwe ha elu
nʼugwu nsọ m.
12Ma aga m eme ka ndị dị nwayọọ nʼobi,
na ndị dị umeala nʼobi
fọdụ nʼetiti ndị Izrel,
ha ga-agbabakwa
Ya bụ, tụkwasị obi
nʼaha Onyenwe anyị.
13Ha agaghị emekwa ihe ọjọọ,
ha agaghị ekwu okwu ụgha.
Ire na-ekwu okwu aghụghọ
agaghị adịkwa nʼọnụ ha.
Ha ga-akpa nri ma dinakwa ala,
ọ dịkwaghị onye ga-eme ka ha tụọ egwu.”

14Bụọ abụ, gị nwaada Zayọn;
tie mkpu, gị Izrel.
Ṅụrịa ọṅụ, e, jiri obi gị niile ṅụrịa ọṅụ,
gị nwaada Jerusalem.
15Nʼihi na Onyenwe anyị ewezugala ahụhụ dịrị gị,
chụghachikwa ndị iro gị azụ.
Onyenwe anyị, onye bụ Eze Izrel, nọ nʼetiti gị.
Ị gaghị atụkwa egwu ihe ọjọọ ọzọ.
16Nʼụbọchị ahụ,
ihe a ga-agwa Jerusalem ga-abụ,
“Atụla egwu, gị Zayọn,
ekwela ka aka gị daa mba.
17 Onyenwe anyị bụ Chineke gị nọ nʼetiti gị,
ọ bụ Dike nʼagha nke na-enye mmeri.
Ọ ga-eji ọṅụ nwee mmasị na ahụ gị;
nʼihi ịhụnanya ya, ọ gaghị abakwara gị mba,
Maọbụ, ọ ga-eme ka ịdị ọhụrụ

kama ọ ga-eji oke iti mkpu abụ ṅụrịa ọṅụ nʼebe ị nọ.”

18“Nʼụbọchị mmemme a kara aka,
aga m ewepụrụ gị ọdachi iru ụjụ,
nke bụ ibu arụ na ihe ịta ụta dịrị gị.
19Nʼoge ahụ,
aga m emesi ndị ahụ niile na-emegbu gị ike.
Aga m azọpụta ndị ụkwụ rụrụ,
chịkọtakwa ndị niile e mere ka ha gaa biri nʼala ndị ọzọ.
Aga m agbanwe ihere ha ka ọ bụrụ ihe otuto
nʼihe na-ewu ewu nʼụwa ebe ha natara ihere.
20Nʼoge ahụ, aga m akpọlata unu nʼụlọ;
mgbe m ga-akpọkọta unu ọnụ.
Aga m eme ka unu na-ewu ewu
ka unu nwekwaa otuto nʼetiti mmadụ niile bi nʼụwa,
mgbe m ga-eweghachi ihe ọma unu
nʼihu anya unu.”
Ka Onyenwe anyị kwuru.
Copyright information for IboBIU